1 Chronicles 10:7 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha.