1 Chronicles 12:17 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”