1 Chronicles 12:19 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”