1 Chronicles 12:23 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.