1 Chronicles 12:38 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndia nile, bú ndikom agha, ndi nēdo agha n'usoro, were obi zuru okè biarue Hebron, ime Devid eze Israel nile: ọzọ kwa, ndi Israel nile nke fọduru nwere otù obi ime Devid eze.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.