1 Chronicles 15:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n'ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n'aru Devid.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.