1 Chronicles 19:18 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ. Devid gburu puku asaa nʼime ndị ikom na-anya ụgbọ agha, gbukwaa iri puku ndị agha anọ ndị na-eji ụkwụ eje. O gbukwara Shofaka, bụ ọchịagha agha ha.