1 Chronicles 19:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, Hanọn na ndị Amọn zipụrụ otu puku talenti ọlaọcha iji gbazite ụgbọ agha na ndị na-agba ụgbọ agha site na Aram Naharaim, na Aram Maaka, nakwa Zoba.