1 Chronicles 19:7 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n'iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n'obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha goro ụgbọ agha ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, na puku abụọ. Ha gokwara eze Maaka na ndị agha ya, ndị bịara maa ụlọ ikwu agha ha na nso Medeba, ebe ndị Amọn sikwa nʼobodo ha niile chịkọta onwe ha pụta ịlụ agha.