1 Chronicles 20:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o do ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike. Otù a ka Devid nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala, na anyụike na-arụ. Otu a ka Devid mekwara obodo niile nke ndị Amọn. Emesịa, Devid na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.