1 Chronicles 20:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n'umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe oge gatụrụ, agha ọzọ daara ha na ndị Filistia, na Gaza. Mgbe ahụ, Sibekai, onye Husha, gburu Sipai, otu nʼime ndị agbụrụ Refaim. Nke a mere ka ndị Filistia chilie aka ha elu, bụrụ ndị a lụgburu nʼagha.