1 Chronicles 21:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we si Gad, Anọm na nkpà nke-uku: biko ka m'dabà n'aka Jehova; n'ihi na obi-ebere-Ya bara uba nke-uku: ma ka m'ghara idabà n'aka madu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu. Ọ ka mma ka m daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ. Nʼihi na obi ebere ya bara ụba nke ukwuu.”