1 Chronicles 21:15 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, Onyenwe anyị hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.