1 Chronicles 22:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Devid we si, Solomon nwam bu nwata di kwa nrò, ma ulo ahu agēwuru Jehova, aghaghi ime ya ka ọ di uku kachasi ulo nile, ibu aha na ibu ihe mara nma diri ala nile: biko, ka m'doziere ya. Devid we dozie ri nne tutu ọ nwua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne.