1 Chronicles 24:6 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n'akwukwọ n'iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ode akwụkwọ Shemaya, nwa Netanel, onye Livayị, dekọtara aha ndị a niile nʼihu eze, na ndịisi ozi eze, ya bụ, Zadọk onye nchụaja, na Ahimelek nwa Abịata, na ndịisi ezi ndị nchụaja, na nke ndị Livayị. E sitere nʼikwu Elieza, họrọ otu ezinaụlọ, sitekwa nʼikwu Itama họrọ otu ezinaụlọ.