1 Chronicles 26:31 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Nke ndi Hebron, Jerija bu onye-isi, ọbuná nke ndi Hebron, dika osuso-ọmumu nile ha si di n'ulo nke ndi bu nna. N'arọ nke-ọgu-abua Devid bu eze ka achọrọ ha, ewe chọta nime ha ndi-dike bu dìnkpà nime Jeza Gilead.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi. Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.