1 Chronicles 27:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-isi nke-asatọ nke diri ọnwa nke-asatọ bu Sibekai onye Husha, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).