1 Chronicles 27:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-isi nke-iteghete nke diri ọnwa nke-iteghete bu Abieza onye Anatot, nke ndi Benjamin: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).