1 Chronicles 6:32 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ha we nēje ozi n'iru ebe-obibi ulo-ikwū nzute n'abù, rue mb͕e Solomon wuru ulo Jehova nime Jerusalem: ha we guzo n'ibu ndi-isi òfùfè-ha dika ikpe ekpere ha si di.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha jere ozi ịbụ abụ ha nʼihu ụlọ ikwu, ya bụ, ụlọ nzute, tutu ruo mgbe Solomọn wuchara ụlọnsọ Onyenwe anyị na Jerusalem. Ha jere ozi ha dịka usoro ije ozi ha si dị.