1 Chronicles 6:49 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Erọn na ụmụ ụmụ ya bụ ndị chụrụ aja onyinye nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, nakwa nʼelu ebe ịchụ aja ihe na-esi isi ụtọ, nke metụtara ọrụ ije ozi niile nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na-ekpuchikwara Izrel mmehie niile ha, nʼusoro dịka ihe niile si dị nke Mosis ohu Chineke nyere nʼiwu.