1 Chronicles 7:40 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndia nile bu umu Asha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi arọputara arọputa, ndi-dike bu dìnkpà, ha bu ndi-isi nke ndi-isi. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, nime usu-ndi-agha, n'ibu-agha, ọnu-ọgugu-ha bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ise.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụ ụmụ Asha ndị a niile bụ ndịisi ezi, ndị a sara anya na mmiri họpụta, ndị bụ dimkpa nʼagha, ndị ndu a ma ama. Ọnụọgụgụ ndị ha tozuru ije agha dị puku iri abụọ na isii (26,000), ndị e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ.