1 Corinthians 1:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na Kraịst eziteghị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa ozi ọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta mmadụ nke ga-eme ka ike ahụ dị na nkwusa ozi ọma nke obe Kraịst, bụrụ ihe efu.
Igbo 2006
N'ihi na Kraist eziteghm ime baptism, kama izisa ozi ọma: ọ bughi n'amam-ihe nke okwu, ka aghara ime ka obe Kraist buru ihe-efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.