1 Corinthians 1:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Chineke mere ihe dị otu a, gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị amamihe, ndị mụrụ akwụkwọ na ndị nrụrịta ụka nke ihe ọmụma ụwa a? Chineke emeela ka amamihe ha na oke mmụta ha bụrụ ihe efu.
Igbo 2006
Òle ebe onye mara ihe nọ? òle ebe ode-akwukwọ nọ? òle ebe onye oge a, onye ya na ibe-ya nājurita ajuju, nọ? Chìneke emeghi ka amam-ihe uwa buru ihe-nzuzu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu?