1 Corinthians 1:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke sitere nꞌamamihe ya chọpụta na ụmụ mmadụ enweghị ike ịmata onye ọ bụ site nꞌoke mmụta ha. Ọ bụ nke a mere o ji webata ụzọ ọ ga-esi zọpụta ndị ga-anabata ozi ọma ya. Ee, ụzọ ozi ọma a anyị na-ekwusa, nke ndị mmadụ na-akpọkwa ihe nzuzu.
Igbo 2006
N'ihi na ebe uwa n'amam-ihe nke Chineke nējighi amam-ihe-ya mara Chineke, ọ di Chineke ezi nma iji ihe-nzuzu nke ihe ahu anēkwusa izọputa ndi kwere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.