1 Corinthians 1:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ozi ọma a bụ ihe nzuzu nye ndị Juu nꞌihi na ha chọrọ ịhụ ihe ịrịba ama na mbara eluigwe nke ga-egosi ha na ozi ọma a bụ eziokwu tupuu ha ekwere. Ọ bụ ihe nzuzu nye ndị mba ọzọ, nꞌihi na ihe ha na-anabata bụ nanị ozizi nke ya na usoro oke mmụta ha na-adakọta.
Igbo 2006
Ebe ndi-Ju nāriọ ihe-iriba-ama di iche iche, ndi-Grik nāchọ kwa amam-ihe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.