1 Corinthians 1:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ihe ahụ ndị mmadụ kpọrọ nzuzu Chineke, aghọọla ihe karịrị amamihe nile nke ndị mmadụ mma. Ihe ahụ ha chekwara na ọ bụ adịghị ike Chineke, nꞌihi ọnwụ Kraịst nwụrụ nꞌobe, aghọọkwala ihe karịrị ike mmadụ nile.
Igbo 2006
N'ihi na ihe-nzuzu nke Chineke kariri madu nile n'amam-ihe; adighi-ike nke Chineke kariri kwa madu nile n'ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.