1 Corinthians 1:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dị ka ihe nzuzu, ihe na-abaghị uru, ka ọ masịrị Chineke iji mee ka ihere mee ndị amamihe ahụ. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dị ka ihe na-adịghị ike ka Chineke ji mee ka ihere mee ndị dị ike.
Igbo 2006
Kama ọ bu ihe-nzuzu nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ndi mara ihe; ọ bu kwa ihe nādighi ike nke uwa ka Chineke rọputara, ka O we me ka ihere me ihe di ike;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.