1 Corinthians 1:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụ Chineke nanị mere ka unu nwee ndụ nꞌime Kraịst Jisọs, onye bụ mmụta anyị na amamihe anyị. Ọ bụ site na Kraịst ka anyị ji nwere onwe anyị, bụrụkwa ndị nsọ, na ndị Chineke zọpụtara.
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu sitere na Ya di nime Kraist Jisus, Onye ghọrọ amam-ihe nye ayi site na Chineke, bú ezi omume, na ido-nsọ kwa, na nb͕aputa:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị.