1 Corinthians 10:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe ndị a nile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị, ka ọ bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye anyị. Ka anyị hapụ ime ihe ndị a ha mere. E dekwara ihe dakwasịrị ha nꞌakwụkwọ ka anyị bụ ndị bi nꞌoge a ọgwụgwụ ụwa dị nso, site na ha mụta ihe.
Igbo 2006
Ma ihe ndia nēmeri ndi ahu n'uzọ ihe-atù; ewe de ha n'akwukwọ nsọ ka ha we buru ihe idu ayi ọdú, ndi ọgwugwu oge ndia ruteworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso.