1 Corinthians 10:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge oriri nsọ, mgbe anyị na-arịọ Chineke ka ọ gọzie iko mmanya ahụ tupuu anyị aṅụọ ya, o gosighị na anyị ndị na-aṅụ ihe dị nꞌiko a kwere na ọ bụ ngọzi si nꞌọbara Kraịst ka anyị na-eketa? Mgbe anyị na-ata beredi anyị nyawara, ọ bụkwaghị uru nke ahụ Kraịst na-eweta ka anyị na-eketa?
Igbo 2006
Iko nke ngọzi ahu nke ayi nāgọzi, ọ̀ bughi nnwekọ ọbara Kraist? Achicha ahu nke ayi nānyawa, ọ̀ bughi nnwekọ aru Kraist?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst?