1 Corinthians 10:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe m na-ekwu bụ na ndị nile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nꞌotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ, ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu mgbe unu so ha rie nri ahụ ha ji chụọra arụsị ha aja.
Igbo 2006
Kama okwu m'nēkwu bu, na ihe ndi mba ọzọ nāchu n'àjà, ha nāchuru ndi-mọ ọjọ, ọ bughi kwa Chineke ka ha nāchuru: ma achọghi m ka unu ghọ ndi unu na ndi-mọ ọjọ nēnwekọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba! Ihe m na-ekwu bụ na ndị niile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nʼotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ. Ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu.