1 Corinthians 10:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ka anyị hapụkwa ịbụ ndị na-ekpere arụsị dị ka ụfọdụ ha mere. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụmụ Izirel nọdụrụ ala na-eri na-aṅụ, ha bilikwara ọtọ ite egwu nꞌihu ehi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.”
Igbo 2006
Unu aghọ-kwa-la ndi nēkpere arusi, dika ufọdu n'etiti ha ghọrọ; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi Israel nọduru ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu abụla ndị na-ekpere arụsị dịka ụfọdụ ha mere. Dịka e dere ya, “Ndị a nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ.”