1 Corinthians 10:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe mmụta ọzọ dịrị anyị bụ ihe dakwasịrị ha mgbe ụfọdụ nꞌime ha mere mmehie ịkwa iko. Ọ bụ iri puku mmadụ abụọ na atọ nꞌime ha nwụrụ nꞌotu ụbọchị ahụ.
Igbo 2006
Ka ayi ghara kwa ikwa iko, dika ufọdu n'etiti ha kwara, we da nwua n'otù ubọchi, ọgu nnù madu abua na nnù iri na asa na ọgu iri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka anyị ghara ịkwa iko dịka ụfọdụ nʼime ha mere, iri puku mmadụ abụọ na atọ nʼime ha nwụọ nʼotu ụbọchị.