1 Corinthians 11:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na anụrụ m na onye ọ bụla na-eri nri nke aka ya. Anụkwara m na ndị nile bu nri ha bịa na-ericha ya ngwangwa. Ha anaghị echere ka ndị na-enweghị nri ha ji bịa soro ha keta oke na nri ha ji bịa. Nꞌihi nke a ụfọdụ na-eribiga nri oke mgbe ndị ọzọ na-anọ agụụ. Ụfọdụ kwa na-aṅụbiga mmanya oke bụrụ ndị mmanya na-egbu.
Igbo 2006
n'ihi na madu nile n'otù n'otù, mb͕e unu nēri, nēburu ndi ọzọ uzọ rie nri-anyasi nke aka ha; agu we nāgu otù onye, onye ọzọ nāṅubiga kwa manya ókè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mgbe unu na-eri nri, ụfọdụ nʼime unu na-eri nri anyasị nke aka ha. Nke mere, nʼotu onye na-anọ agụụ ebe onye ọzọ na-aṅụbigakwa mmanya oke.