1 Corinthians 11:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iri nri na ịnụ mmanya nꞌụlọ unu tupuu unu abịa nꞌụlọ chọọchị? Karịa na unu ga-ebu ihe ndị a bịa nꞌime chọọchị ime ndị ogbenye na ndị na-enweghị ike iweta nri nke ha ihe ihere. Gịnị ọzọ ka unu chọrọ ka m kwuo banyere ihe ndị a? Ùnu chọrọ ka m too unu? Mbaa!
Igbo 2006
Ọ̀ gābu na unu enweghi nọ̄ ulo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu nime ha? ma-ọbu ùnu nēlelì nzukọ Chineke, me kwa ndi nēnweghi ihe ka ihere me ha? Ọ̀ bu gini ka m'gāsi unu? #m'gēto unu? Etoghi m unu na nka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A ga-akpọ nke a gịnị? Ọ bụ na unu enweghị ụlọ ebe unu ga-anọ rijuo afọ ma ṅụjuokwa afọ? Ka ọ bụ na unu na-elelị nzukọ Chineke na emenye ndị na-enweghị ihe ihere? Gịnị ka m ga-agwa unu? Aga m eto unu maka nke a? Agaghị m eto unu maka nke a.