1 Corinthians 11:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risịrị nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị nꞌetiti unu na Chineke, nke e ji ọbara m mee ka o guzosie ike. Meekwanụ otu a icheta m.”
Igbo 2006
Mb͕e ha risiri nri-anyasi, Ọ nara kwa iko otú ahu, si, Iko a bu ọb͕ub͕a-ndu ọhu nime ọbaram: nēmenu nka, mb͕e ọ bula unu gāṅu ya, ka unu we nēchetam.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụzọ dị otu a kwa, o bulitere otu iko mmanya mgbe ha risiri nri sị, “Iko a bụ ọgbụgba ndụ ọhụrụ nʼọbara m. Oge ọbụla unu na-aṅụ ya, na-emenụ nke a iji na-echeta m.”