1 Corinthians 11:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ ataa beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-echeghị echiche banyere anụ ahụ Kraịst na ihe ọ pụtara, ọ na-eri, na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, nꞌihi na ọ bụ ọnwụ Kraịst ka o ji egwuri egwu.
Igbo 2006
N'ihi na onye nēri nāṅu kwa, ọ nēri nāṅu kwa ikpé nye onwe-ya, ma ọ buru na ọ tuleghi aru ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na onye ọbụla na-eri achịcha ahụ maọbụ ṅụọ site nʼiko ahụ na-echeghị echiche, ọ na-eri, na-aṅụtakwara onwe ya ikpe ọmụma, ma ọ bụrụ na ọ tuleghị uche banyere ahụ Kraịst.