1 Corinthians 11:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọ bụla ya rie nri nꞌụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, mgbe unu nile zukọtara. Aga m edozi okwu ndị ọzọ mgbe m bịara.
Igbo 2006
Ọ buru na agu nāgu onye ọ bula, ya rie ihe n'ulo-ya; ka unu ghara ibiakọ n'uzọ gēweta ikpé. Ihe nile fọduru ka m'gēdozi mb͕e ọ bula m'gābia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na agụụ agụọ onye ọbụla ya rie nri nʼụlọ ya, ka ọ hapụ iwetara unu ikpe ọmụma. Aga m enye ntụziaka banyere ihe niile ndị ọzọ mgbe m bịara.