1 Corinthians 12:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ọ bụla nꞌime anyị bụ otu akụkụ anụ ahụ Jisọs Kraịst. Ụfọdụ nꞌime anyị bụ ndị Juu, ụfọdụ abụghị ndị Juu, ụfọdụ bụ ndị nwe onwe ha, ndị ọzọ bụ ndị ohu. Ma ọ bụ otu Mmụọ ahụ mere anyị nile baptizim baa nꞌime otu ahụ Kraịst ahụ. Chineke enyekwala anyị nile nꞌotu nꞌotu Mmụọ Nsọ ahụ.
Igbo 2006
N'ihi na nime otù Mọ Nsọ ka emere ayi onwe-ayi nile baptism ibà n'otù aru, ma ayi bu ndi-Ju ma-ọbu ndi-Grik, ma ayi bu ndi-orù ma-ọbu ndi nwere onwe-ha; eme-kwa-ra ka ayi nile ṅua nime otù Mọ Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼotu Mmụọ Nsọ ahụ ka e mere anyị niile baptizim nʼotu nʼotu, ma ndị Juu ma ndị Griik, ma ohu ma ndị nwe onwe ha. E meela ka anyị ṅụọ ọbara ya, nʼime njikọ nke otu Mmụọ Nsọ ahụ.