1 Corinthians 12:31 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ime ihe nile ndị a, kama gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị mma nꞌime ha. Geenụ ntị ka m gwa unu onyinye ọzọ kachasị onyinye ndị a nile mma.
Igbo 2006
Ma werenu obi nānu ọku chọ onyinye-amara ndia nke kari uku. Tukwasi ihe ndia anamegosi kwa unu uzọ nke kachasi nma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, gbalịsienụ ike inweta onyinye kachasị dị elu karịa. Ma aga m ezi unu ụzọ nke kachasị ihe a niile mma.