1 Corinthians 13:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme.
Igbo 2006
Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n'anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A sị na m na-asụ asụsụ dị iche iche nke ndị mmadụ maọbụ nke ndị mmụọ ozi, ma ahụghị m mmadụ ibe m nʼanya, abụ m naanị ogene na-eme ụzụ maọbụ mbadamba efere na-ada ụda.