1 Corinthians 13:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ.
Igbo 2006
Mb͕e m'buri nwa ọhu, anamekwu dika nwa ọhu, anamatukwasi uche n'ihe dika nwa ọhu, anamagu ihe dika nwa ọhu: ub͕u a mb͕e m'ghọworo okenye, emewom ka omume nwa ọhu ghara idi irè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m bụ nwata, ekwuru m okwu dịka nwata, echiche m niile bụ echiche nwata. Izuzu obi m niile bụkwa nke nwata. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịghịkwa m akpa agwa dịka nwata ọzọ.