1 Corinthians 14:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na Chineke ga-eji asụsụ ndị mba ọzọ gwa ndị ya bụ ụmụ Izirel okwu, ma ha agaghị ege ntị.
Igbo 2006
Nime iwu Chineke ka edeworo ya, si, M'gēji madu ndi nāsu asusu di iche, ji kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi di iche, gwa ndi nka okwu; ma ọbuná otú a ha agaghi-anu olum, ka Onye-nwe-ayi kwuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E dere ya nʼakwụkwọ iwu, “Site na egbugbere ọnụ ndị mba ọzọ sitekwa nʼire ndị na-asụ iche iche ka m ga-agwa ndị a okwu, ma ọbụladị otu a, ha agaghị ege m ntị, ka Onyenwe anyị kwuru.”