1 Corinthians 14:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nke a na-egosi na ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe dị mkpa nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ịrịba ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma, nke bụ ikwusa eziokwu Chineke, bụ ihe dị ndị kweere na Kraịst mkpa. Ndị na-ekweghị ekwe anaghị ahụ mkpa nke a dị.
Igbo 2006
Ya mere asusu di iche iche ndia, emere ka ha buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi kwere ekwe, kama nye ndi nēkweghi ekwe: ma emere ibu-amuma ka ọ buru ihe-iriba-ama, ọ bughi nye ndi nēkweghi ekwe, kama nye ndi kwere ekwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe nlere anya nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma bụ maka ndị kwere ekwe, ọ bụghị maka ndị na-ekweghị ekwe.