1 Corinthians 14:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri?
Igbo 2006
Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n'otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na nzukọ niile ezukọọ nʼọgbakọ ekpere, mmadụ niile a na-asụ nʼolu dị iche iche nʼotu mgbe, ọ bụrụkwa na ndị na-aghọtaghị, maọbụ ndị na-ekweghị ekwe abata nʼebe ahụ, gịnị ka ha ga-ekwu? Ha ọ gaghị asị na isi emebiela ndị a?