1 Corinthians 14:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ.
Igbo 2006
Ma asi na ha nile ebu amuma, ma ọ buru na onye nēkweghi ekwe ma-ọbu onye nāmutaghi akwukwọ gābata, ha nile nātu ya nmehie-ya n'anya, ha nile nēkpe kwa ya ikpé;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe maọbụ onye ọhụrụ abata mgbe onye ọbụla na-ebu amụma, ha ga-abụ ndị mmadụ niile ga-atụ mmehie ha nʼanya maakwa ha ikpe mmehie.