1 Corinthians 14:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ọ ga-anọ na-ege ntị, ihe ọ ga-anụ ga-emekụta echiche nzuzo ya nile, mee ka ndụ ọjọọ ya pụta ìhè. Nke a ga-emekwa ka o gbuo ikpere nꞌala kpọọ isi ala nye Chineke sị, “Nꞌezie, Chineke nọ nꞌetiti unu.”
Igbo 2006
ihe-nzuzo nile nke obi-ya aputa ìhè; ọ gēsi otú a da kpuchie iru-ya n'ala kpọ kwa isi ala nye Chineke, nēkwuputa na ọ bu ezie na Chineke nọ n'etiti unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe a na-eme ka ihe nzuzo nke obi ha niile pụta ìhè, onye dị otu a ga-egbu ikpere nʼala kpọọ isiala nye Chineke sị, “Nʼezie, Chineke nọ nʼetiti unu.”