1 Corinthians 14:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a, ụmụnna m, gịnị bụ isi ihe m na-ekwu? Mgbe ọ bụla unu zukọrọ ife Chineke, ụfọdụ kwesịrị ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe, ma ọ bụ gwa unu ozi dị mkpa Chineke gosiri ya, ma ọ bụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọ bụla e mere nꞌime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-abara onye ọ bụla uru.
Igbo 2006
Ọ̀ bu gini kwa, umu-nnam? mb͕e ọ bula unu biakọrọ n'otù ebe, unu nile n'otù n'otù ji abù ọma, ji ihe-ozizí, ji ihe-nkpughe, ji asusu di iche, ji isughari-asusu. Ka eme ihe nile ka ewe wuli madu nile elu dika ulo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ụmụnna m, kedụ otu o kwesiri ịdị? Mgbe ọbụla unu zukọrọ, ụfọdụ kwesiri ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe; maọbụ gwa unu ozi dị mkpa e gosiri ya, maọbụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọbụla e mere nʼime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-ewuli onye ọbụla elu.