1 Corinthians 14:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu nile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu nile enwee onyinye izisa ozi ọma. Nke a bụ nꞌihi na nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma bara uru karịa nwoke na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, onye nwekwara ike ikọwara chọọchị ihe o kwuru.
Igbo 2006
Otú ọ di, anamachọ ka unu nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma achọkaririm ka unu nēbu amuma: onye nēbu amuma ka kwa onye ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma-ọbughi na ọ nāsughari ya, ka ewe wuli nzukọ Kraist elu dika ulo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu niile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche; ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu niile enwee onyinye ibu amụma. Nke a bụ nʼihi na onye ahụ na-ebu amụma bara uru karịa onye na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, ka e nwee ike wulie chọọchị.