1 Corinthians 14:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ nke unu na-adịghị anụ, olee uru m baara unu? Ọ baghị uru ọ bụla! Kama ọ bụrụ na m ekwuo okwu nꞌụzọ doro anya, banyere ihe Chineke kpughere gosi m, ma ọ bụ ihe nile m maara, ma ọ bụ ihe gaje ime, ma ọ bụ ozizi nke eziokwu Chineke, nke a ọ̀ gaghị abara unu uru?
Igbo 2006
Ma otú ọ di, umu-nnam, asi na agamabiakute unu were asusu di iche iche nēkwu okwu, ùrù gini ka m'gābara unu, asi na agwaghi m unu okwu n'uzọ nkpughe, ma-ọbu n'uzọ ihe-ọmuma, ma-ọbu n'uzọ ibu-amuma, ma-ọbu n'uzọ ozizí?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ unu na-adịghị aghọta, ole uru m baara unu, ma ọ bụghị ma m na-ekwu okwu banyere ihe ekpughere gosi m, maọbụ ihe niile m maara, maọbụ ihe gaje ime, maọbụ ihe nkuzi?